Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
Mpụtara Aha otutu ụmụ Nwoke na Nsirihụ ndị Igbo n’usoro Amụmamụ Asụsụ Ncheke
Florence Uju Ibeh, PhD Ngalaba Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka, Naịjirịa, P.M.B 5025. Email: uf.ibeh@unizik.edu.ng
Ụmịedemede
Nchọcha a na-atụle mpụtara aha otutu ụmụ nwoke na nsirihụ ndị Igbo n’usoro amụmamụ asụsụ ncheke. Asụsụ ncheke bụ amụmamụ e kepụtara ọhụrụ ji nghota amụ asụsụ Aha otutu n’aka nke ọzọ pụtara aha mmadụ nyere onwe ya site n’echichi maọbụ nke ndị nwe mmadụ rinyere ya dị ka ha siri hụta onye ahụ.
Nsogbu nchọchọ a bụ imata ihe pkatara na ọtụtụ ụmụ nwoike na-enwe aha otutu ebe ufodụ enweghi. Ụfọdụ ebumnobi nchọcha a bụ ịnye nkọwa aha otutu, ịchọpụta ụdị aha otutu ụmụ nwoke dị iche iche, echiche dị n’aha otutu ndị ahụ na otu ha siri nweta maọbụ rie aha otutu ahụ. Ọzọ bụ ịchọpụta uru na ọghọm dị n’aha otutu. Nchọcha a bụ nke a gbasoro usoro sovee mee na naanị obodo asatọ n’ime obodo iri na asaa dị n’okpuru ọchịchị Idemili Nọt na Saụt na Steeti Anambara. A gbasoro usoro ntụwaị họrọ mmadụ asatọ agbara ajụjụ ọnụ ma tulekwa ihe ndị e dere n’ụdị isiokwu a maka nkwado ihe a na-ede. Atụtụ nchọcha bụ atụtụ Ndịna Ncheke nke Lakoff na Johnson (1980). Atụtụ a na-akọwa na tupu a mata echiche okwu ọ bụla, a gaghị elefere ọrụ ụbụrụ maọbụ gburu gburu na-arụ anya. Atụtụ ọzọ maka nchọcha a bụ atụtụ Njirimee nke Wittgenstein (1953). Atụtụ a na-akọwa na echiche okwu ọbụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n’asụsụ Ụfọdụ ihe achọpụtara na ngwụcha ihe ọmụmụ a bụ na aha otutu ụmụ nwoke na-aza juru eju bara abara. Ụfọdụ aha ka ha riiri maọbụ zaara onwe ha site n’echichi, ụfọdụ bụrụ nke ndị nwe onye ahụ riwere ya dị ka ndụ ya maọbụ ụdịdị ekerechi ahụ ya siri dị Ọzọ bụ na aha otutu ndị a niile na-enwe echiche na nghọta so ya. A chọpụtakwara na aha otutu na-enye aka ịchịkwa akparamagwa mmadụ tụmadụ ndị e riri site ka ndụ onye ahụ na-ebi siri dị.Nchọcha a na-atụ arọ ka ụmụ nwoke ruru ihe e ji mmadụ eme gaa n’ihu na-aza aha otutu dị mma maka nchekwe akparamagwa dị n’ịza aha otutu.
Okwu mmalite
N’ala Igbo, nwoke ọ bụla tozuru ihe e ji nwoke eme na-enwe aha ọ na-aza n’abụghị aha e nyere ya mgbe a mụrụ ya. Aha bụ otu njirimara mmadụ Ọ pụtara ihe a na-akpọ mmadụ, anụmanụ, osisi, ebe na ihe ndị ọzọ ma ndị na-eku ume ma ndị anaghị eku ume n’ụzọ dị iche iche. Ọ bụ ihe dịwagara iche e ji ahụba mmadụ maọbụ ihe ndị ọzọ ama. Ka o sila dị, e nwere nkenụdị aha dị iche iche dị ka o si metụta ihe na-aza aha ahụ mana aha a na-atụle ebea bụahaotutu ụmụ nwoke na-eri maọbụ na-aza na mpaghara
Idemili Nọt na Saụt dị n’okpuru ọchịchị Steeti Anambara.
Aha otutu pụtara aha njirimara pụrụ iche mmadụ tolitere zawa, e nyere ya maọbụ o ji aka ya zawa abụghị aha a bara ya na nwa. Ọ bụghị naanị ụmụ nwoke na-enwe aha otutu. Ụmụ nwaanyị sokwa enwe aha otutu nke ha. Mana dị ka nchọcha a siri dị, a agaghị atụle aha otutu ụmụ nwaanyị ebe a. Naanị aha otutu ụmụ nwoke ka a ga-atụle.
Aha otutu mmadụ na-aza nwere ndị na-ezipụta ihe nkwanye ugwu nwee ndị na-ezipụta ihe nkọcha. O nwere ike ịbụ aha onye ahụ riiri onwe ya maọbụ nke o nwetara site n’echichi o chiri dị ka echichi nze na ọzọ, ichie na ndị ọzọ maọbụ nke ndị mmadụ bara ya site ka o si dị n’anya maọbụ n’ụdị agwa maọbụ ndụ ọ na-ebi. Ma aha otutu ọ bụ nke mmadụ riiri onwe ya maọbụ nke ndị mmadụ bara ya ga-enwerịrị echiche na nghọta dị na ya. Ka o sila dị, aha otutu a ga-eleba anya ebe a bụ nke na-egosi ka mmadụ si dị n’anya na nke na-ezipụta echiche ihe dị mma gbasara onye riri aha ahụ. Amụmamụ asụsụ ncheke a ga-eji atụtụ ya tụlee nchọcha a bụ ngalaba amụmamụ sayensị asụsụmalitere ọhụrụn’agbataafọ1980.Ọmaliterekaenwecharamgbaghan’etitindịkwadoroatụtụnsinagburugburu na nke nsinụbụrụ. Ndị otu amụmamụ asụsụ ncheke kwadoro na, ma ngwa mmata asụsụ ma ngwa nsina gburugburu dịcha mkpa n’iji mụta asụsụ. Amụmamụ asụsụ ncheke na-akọwa n’asụsụ bụ mbụrụ maka na ọ bụ echiche nhụrụnanya ka a na-amado na nke nhụrụnuche. Ihe amụmamụ a na-elekwasị anya bụ nghọta.
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
Otu n’ime mbunuuche amụmamụ asụsụ ncheke bụ ịmata ka amamihe mmadụ ha na ka mmadụ si echedebe echiche site n’iji otu usoro doro anya. Ya bụ e kepụtara ya iji mata ka asụsụ na ime mmụọ mmadụ si agakọ.
Aha otutu ụmụ nwoke a na-eme ebe a dị ọtụtụ. Ụfọdụ aha otutu na-emetụta ihe nhụrụnanya. Ya bụ ka mmadụ siri dị n’anya, ebe ụfọdụ na-emetụta ihe nhụrụnuche nke na-arụtụ aka n’ihe ahụghị anya dị ka amụmamụ asụsụ ncheke siri kọwaa.
N’aka nke ọzọ, atụtụ njirimee e ji mee nchọcha a na-egosikwa na echiche dị n’aha otutu mmadụ na-aza bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme maka na atụtụ njrimee na-ewepụta echiche dị n’okwu na nsirihụ ndị nwe asụsụ ahụ. Ebumnobi nchọcha a bụ ịmata ihe bụ aha otutu, ịchọpụta ụdị aha otutu ụmụ nwoke dị iche iche, ịmata aha otutu ndị mmadụ nwere ike ịzara onwe ha n’echighi echichi na ndị ha na-aza site n’echichi. Ebumnobi ọzọ bụ ịmata mpụtara aha otutu ndị ahụ, otu ha siri nweta maọbụ rie aha otutu ahụ, mgbe aha otutu nwoke ji apụtakarị ihe, na uru na ọghọm dị n’aha otutu. Ndị a gbara ajụjụ ọnụ dị mmadụ itoolu sitere n’obodo itoolu dị n’ime obodo iri na asaa e nwere n’Idemmili Nọt na Saụt ndị chiri echichi. Mmadụ ise si n’Idemmili Nọt ebe mmadụ anọ si n’Idemmili Saụt. Ihe kpatara ime ya etu ahụ bụ maka na e nwere obodo iri n’Idemmili Nọt nwee obodo asaa n’Idemmili Saụt. E depụtara obodo ndị a gbara ajụjụ ọnụ a si, aha ha, ọrụ ha na afọ ole ha gbara na ngwụcha nchọcha a. N’ime ha, mmadụ abụọ ekweghi kwu aha ha nke mere na aha ha apụtaghị na ndị a gbara ajụjụ ọnụ. N’iji hụ na nchọcha a gara nke ọma, a haziri ya n’usoro ndị a: mmalite, ntụlegharị agụmagụ, ntulegharị nchọcha e mere n’isi o kwu, atụtụ mgbakwasa ụkwụ, nzipụta na ntucha ngwa nchọcha, nchịkọta na mmechị
Nchọcha a ga-abara ndị nkuzi,ụmụ akwụkwọ na ndị na-eme nchọcha uru n’ihi na ọ ga-eme ka a mata aha otutu ndị mmadụ nwere ike ịzara onwe ha na ndị ha nwere ike ịza n’echichi tiyekwara echiche ha na-ezipụta. Ọ ga-emekwa ka ihe e derela gbasara ụdị isi o kwu a bawanye ụba.
Ntụlegharị agụmagụ
Na mpaghara a, ka a ga-atụle ọkpụrụkpụ okwu ụfọdụ metutara Isiokwu a ndị gụnyere:
Mpụtara
Mpụtara maọbụ echiche bụ ihe na-akọwa nghọta dị n’okwu e kwuru ekwu. Nke a gosiri na ihe ọbụla mmadụ kwuru na-enwe mpụtara dị na ya. E nwere ike ịkọwa mpụtara dị ka nghọta dị n’okwu maọbụ ahịrịokwu ọbụla dị n’otu asụsụ Ọ bụkwa ngalaba sayensi asụsụ ọrụ ya bụ ịhụ maka nghọta dị iche iche dị n’okwu e kwuru ekwu. Na nkọwa Saeed, (2009), mpụtara bụ amụmamụ banyere nghọta okwu e kwuru si n’asụsụ pụta. Yule, (1964) kọwara mpụtara dị ka amụmamụ gbadoro ụkwụ na nghọta mkpụrụokwu, nkebiokwu, nkebiahịrị na ahịrịokwu. Mbah, Mbah, Ikeokwu, Okeke, Nweze, Ugwuona, Akaeze, Onu, Eze, Prezi na Odii (2013) kọwara ya dị ka uche maọbụ ntapị dị na mkpụrụokwu maọbụ ahịrịokwu.
Nsirihụ
Nsirihụ bụ usoro obibi ndụ na ụwa anyị nọ n’ime ya. Na nkọwa Mbah, Mbah, Ikeokwu, Okeke, Nweze, Ugwuona, Akaeze, Onu, Eze, Prezi na Odii, (2013), nsirihụ pụtara nkwenye na-egosi etu e si hụ ma ghọta ndụ n’obibi ya. Isidienu (2018) kpọrọ ya nsirihụndụ. Ọ kọwara ya dị ka etu agbụrụ ọ bụla si ghọta ụwa na ndụ mmadụ bi n’elu ụwa. Ọ gara n’ihu kwuo na e nwere ike ikwu na nsirihụ gbasaara ọmụmụ maọbụ nchọcha banyere amamihe maka ndụ mmadụ, ụwa na ihe dị iche iche na-eme n’ụwa.
Asụsụ ncheke
Asụsụ ncheke bụ amụmamụ sayensị asụsụ na-elekwasị anya na nghọta okwu ọ bụla nwere. Evans na Green(2007)kwenyerenaasụsụnchekebụamụmamụ pụtaraọhụrụnasayensị asụsụmabụrụotun’ime ihe e kepụtara ma na-akpalite mụọ. Amụmamụ ncheke bụ amụmamụ e kepụtara ọhụrụ ji nghọta amụ asụsụ.Dị ka Lakoff (1987)siri kwu, amụmamụ nchekebụ amụmamụ pụtara ọhụrụnke e wekọtara n’ihe a maara gbasara uche site na ngalaba amụmamụ ndị ọzọ bụ amụmamụ ime mmụọ, sayensi asụsụ, antrọpọlọjị, filọsọfi na amụmamụ kọmputa. Ọ na-achọ azịza doro anya maka ajụjụ ndị a : ọ bụ ezi okwu na asụsụ na-agbaso usoro ichemi echiche ime? Mmadụ ọ na-eji ihe ọ maara atụnyere maọbụ na- ekwu
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
ihe ọ maghị? na Kedụ etu mmadụ si etinye n’ọrụ ihe ndị ọ hụgoro na ndụ ya? Dingemanse (2006) kwadoro nkọwa Lakoff nke na-ekwu na asụsụ ncheke adịghị ele anya na mmebe na nhazi asụsụ kamaọbụ n’usoro echiche mmadụ nke nwere ike ịbụ ntọnala n’imebe asụsụ. Ọ na-akọwakwa ka mmetụta mmadụ na-enwe n’ụwa si agbazi ahịrị asụsụ ya site n’ichemi echiche ime.
Na nkọwa Langacker (1987) amụmamụ ncheke ji nghọta amụ asụsụ. Mbunuuche amụmamụ a bụ ịtụle etu ụbụrụ si arụ ọrụ n’ikepụta asụsụ na echiche. Ndị otu amụmamụ a kọwara na asụsụ ọbụla nwere mkpụrụụda dị iche iche e ji asụ asụsụ ma na-emepụta okwu dị n’asụsụ ahụ. Ụfọdụ okwu ndị ahụ, e mepụtara nwere ndị nwere echiche aka ha na ndị enweghị echiche aka ha nke a na-esi n’ọnọdụ ha nọ n’ahịrịokwu achọpụta echiche dị na ha. Amụmamụ a na-ekpokọta ndoko asụsụ ọnụ mgbe ọ na-ewepụta ụzọ atọ o si hụta asụsụ. Ụzọ atọ ndị ahụ bụ, ụtọ asụsụ onye ọbụla bụ ka o si ghọta gburugburu ya, asụsụ bụ ihe mmụta dị ka ihe a na-ekwu maka ya si dị, na n’asụsụ na amamihe ndị ọzọ na-agwakọta n’otu ọwa ụbụrụ karịa asụsụ inwe ọwa ụbụrụ nke aka ya iche. Ọ bụghị naanị Langacker nwere echiche a naekwu na asụsụ na amamihe ndị ọzọ na-agakọ ọnụ n’ime otu ọwa. Croft na Cruise (2004) nwere ụdị nkwenye a. Ya mere ha ji sị na isi okwu asụsụ ncheke abụghị inwe ọwa echiche pụrụ iche n’ebe ọwa nghọta amamihe ndị ọzọ dị. Ha na-egosi na ọ bụ otu ọwa ka asụsụ na echịche ihe ndị ọzọ si aga n’ụbụrụ isi mmadụ. Ndị otu amụmamụ asụsụ ncheke na-ekwu, na a bịa na nhazi echiche na nchịgharị echiche, na e nwere otu okwu mejupụtara ahịrịokwu si agakọ n’amụmamụ asụsụ ncheke. Dị ka ha si kọwaa, oge
ụfọdụ, okwu nhurunuche na nke nhụrụnuche na-agakọ, oge ụfọdụ, nhụrụnanya na nhụrụnanya, oge
ụfọdụkwa ọ bụrụ nhụrụnanya na nhurunuche dị ka e gosiri n’ịma atụ na-esota ebe a.
Ịma atụ :
Chukwu bụ Mmụọ / Mmanwụ
Chukwu → Okwu nhurunuche
Mmanwụ/mmụọ → Okwu nhụrụnuch
Obi bụ nwoke
Obi → Okwu nhụrụnanya
Nwoke → Okwu nhurunanya
Ngọzị bụ Ikuku
Ngọzị → Okwu nhụrụnanya
Ikuku → Okwu nhurunuche
Ịhụnanya na-akpalite uche
Ịhụnanya → nhurunuche
Uche → nhurunuche (Mbah 2019)
Aha
Geertz (2006) kwuru na aha na-egosi onwe maọbụ onye maọbụ ihe mmadụ bụ dị ka o si metụta ndị nwe onye ahụ, ọkachasị ezinaụlọ nne na nna onye ahụ n’ihi na a na-ewe aha ahụ dị ka nkwanye ugwu n’ebe onye nwetara aha nọ. William (2005) hụrụ aha dị ka okwu maọbụ mkpokọta okwu dị iche iche e ji amata mmadụ. Aha ahụ na-egosipụta njirimara onye ahụ a na-ekwu maka ya kpọmkwem. Ọzọ, aha abụghị naanị ndịiche mmadụ nwere n’ebe ndị ọzọ nọ ka ọ na-egosi kama ọ na-akọwapụta ụdịdị onye na-aza aha ahụ
Mbiti (1977) kwuru na aha ndị mba Afrịka dum nwere echiche dị n’ime ha. O kwukwara na ụfọdụ aha na-akọwa ụdị mmadụ onye ahụ bụ maọbụ akparamagwa ya maọbụ ụfọdụ ihe nrịba ama megasịrị na ndụ onye ahụ. N’otu aka ahụ, Ekwealọ (1996) tụnyere ụtụ nke ya ma nye nkwado n’ihe Mbiti (1977) kwuru. O kwuru na aha ọ bụla e nyere mmadụ na-enwe mpụtara na ihe ọ na-egosipụta. N’ịga n’ihu, Ọbaji (1982) kwuru na aha nwere ihe ọ na-egosi, a bịazie n’ebe ndị Igbo nọ, ọ na-egosi ihe ahụ ndị mmadụ na-aghọta mgbe onye na-aza aha ahụ kpọrọ ya maọbụ mgbe ndị ọzọ kpọrọ ya aha ahụ. Aha naenye akụkọ ntọala ndụ onye na-aza ya.
Bubu na Offiong (2014) kọwara na aha bụ otu ihe gbara ọkpụrụkpụ e ji ahụba mmadụ ama. Ọ bụkwa aha ka e ji gosipụta ndịiche dị n’etiti mmadụ na agbụrụ dị iche iche. Ha gara n’ihu kwuo na ịba mmadụ
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
aha maọbụ aha e nyere mmadụ bụ otu n’ime ihe e nwere ike iji nabata mmadụ n’otu okpukperechi maọbụ nke ọzọ.
Aha otutu
Aha otutu dị ka alụtatuburu aka bụ aha mmadụ tolitere zawa abụghị aha a bara onye ahụ na nwa. . Ọ bụ aha pụrụicheeji egosipụtaihedịwagaraiche onyeahụ mere. Onwereike ịbụ aha oriri site n’echichi o chiri dị ka echichi ọzọ maọbụ nke ndị mmadụ bara ya site n’ụdị agwa maọbụ ndụ ọ na-ebi maọbụ ka o si dị n’anya. Dị ka ndị odee gbara ajụjụ ọnụ siri kọwaa, aha otutu a na-etu nwere ndị na-azara ya onwe ha n’echighi echichi ọ bụla. Ụdị aha a na-aza n’echighi echichi ọ bụla na ya nwerendị na-enwe mpụtara doro anya nwekwa ndị anaghị enwe mpụtara doro anya. Ọ bụghi ụdị aha onye ọ bụla bụ onye Igbo naama ma na-aghọta ozigbo. Ụdị aha mmadụ nwere ike iri n’echighi echichi nwere ike ịbụ ka onye ahụ dị n’anya maọbụ ụdị agwa maọbụ ndụ onye ahụ na-ebi.
Ntụlegharị nchọcha e merela n’isi okwu
Ogwudile (2019) na nchọcha ya ọ kpọrọ ‘The Socio-cultural and Linguistic Implications of Igbo Names’ nke ọ gbadoro ụkwụ n’Ezeagụ dị na Steeti Enugwu wee mee. Ọ tulere ụdị aha a na-aba mmadụ dị ka o si metụta omenala na asụsụ anyị Nchọpụta o nwetara na-egosi na aha ndị nne na nna na-aba
ụmụaka ha na-egosi echiche obi ha na ihe ndị mere tupu a mụọ nwata. Nchọcha ya na-akwado na ebe ọ bụ na aha a na-aba ụmụaka na-emetụta omenala na asụsụ anyị, ka anyị gaa n’ihu na-ahụ asụsụ anyị n’anya site n’inye ụmụ anyị aha Igbo maka na ọ bụ omenala anyị ka anyị jiri biri.
Ugonna (1983) na nkọwa nke ya kwuru na aha ọ bụla nwere ihe ngosipụta tinyere n’ọtụtụ oge na ọ naezipụta echiche,ihe ngosi maọbụ nkwenye ndị nne na nna. O nwere ike gosi maọbụ kwupụta akparamagwa maọbụ arịrịọ a na-arịọ na otito maọbụ ịkọcha Chukwu, ndị enyi, ikwu na ibe, onwe mmadụ maọbụ ọha obodo. Dị ka o si kọwa,a na-ahụta ahaaka mmadụ nwere n’asụsụ Igbo ka ihe nkwanye ugwu na-egosi ihe niile dị mkpa n’onye ahụ Ọzọ, aha e nyere mmadụ nwere ike ịgba ama a hụrụ anya maka ọdịnihu nwata. Ya bụ aha ndị Igbo na-enwe mpụtara.
Ọrụ Ogwudile na Ugonna yiri nke a na-eme maka na ọ na-ekwu maka ahaaka a bara mgbe a mụrụ onye ahụ mana ọ dị iche na nke a na-eme maka na ọ bụ aha otutu mmadụ zaara onwe ya.
Atụtụ mgbakwasa ụkwụ
Atụtụ ndị e ji mee nchọcha a bụ nke ndịna ncheke nke Johnson na Lakoff (1980) na atụtụ njirimee nke Ludwig Wittgenstein (1953). Atụtụ ndịna ncheke nke Johnson na Lokoff na-akọwa na tupu a mata echiche maọbụ mpụtara okwu ọ bụla, agaghị elefere ọrụ ụbụrụ maọbụ gburugburu na-arụ anya. Atụtụ a na-akọwa na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ụbụrụ o buru pụta ụwa iji mụta asụsụ, ọ gaghị enyenwu ihe ọ bụla aha nwere echiche. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na e nweghi ngwa mmụta asụsụ mburupụtaụwa, ya bụ ngwa mmụta asụsụ agaghị arụli ọrụ. Atụtụ a na-akọwa na etu esi aghọta asụsụ na-agbado ụkwụ n’etu esi aghọta asụsụ nhụrụnuche. Ihe ọzọ atụtụ a na-akọwa bụ na mbụrụ na atụmatụokwu ndị ọzọ bụ otu ihe. Atụtụ a na-akọwakwa ka mbụrụ si arụ ọrụ site n’ịkọwa na mbụrụ na-eji otu ihe amado n’ihe ọzọ nke n’enweghị agwara ya. N’atụtụ a,, Mbah na Mbah (2014) na-akọwa na mpụtara ihe bụ ihe ahụ naagbata mmadụ n’uche mgbe a kpọtụrụ ihe ahụ aha. A kpọọ ‘mmadụ’ ihe na-abịa n’echiche mmadụ bụ onye Chi kere eke nwere ụkwụ abụọ, na-akwụtị akwụtị ma nwee uche. Enyo nwoke maọbụ nwaanyị agaghị abata n’echiche a maka na ọ bụ site na njirimara izugbe mmadụ ka e si enweta ‘nwoke’, ‘nwaanyị’, ‘nwata’, ‘okenye’ d.g. Nke a bụ iji kwado na e nwere ihe nhụrụnanya na nke nhụrụnuche. Atụtụ a ji nghọta amụ asụsụ. Ọ bara uru maka ọrụ ya niile ndị a.
N’aka nke ọzọ, atụtụ njirimee bụkwa atụtụ a ga-eji rụọ ọrụ na nchọcha a. Atụtụ a na-akọwa na a naamata mpụtara mkpụrụokwu, nkebiokwu maọbụ ahịrịokwu ọ bụla dị ka e si webata ya n’okwu na n’ụdị ọnọdụ a nọ kwuo ya. Ihe ọ na-akọwa bụ na echiche okwu ọ bụla bụ ihe ndị nwe ya ji ya eme n’asụsụ Ya bụ na o nweghị okwu nwere echiche aka ya mana a ma na echiche nwere ọdịdị nnọrọ onwe nke naemetụghị ọnọdụ ya n’asụsụ maọbụ n’atụmatụokwu. Atụtụ ndị a bara uru maka na ha na-akọwa ka asụsụ na ime mmụọ mmadụ si agakọ tinyere na ọ bụ ihe ndị nwere ka ha ji eme ihe dị ka atụtụ njirime si zipụta.
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343)
Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
Nchịkọta ntụlegharị agụmagụ
N’ebe a, a tụlere agụmagụ dị iche iche ndị mmadụ derela n’ihe ndị yitere Isiokwu a maka iji mata ebe
emebeghị nchọcha na ya.
Site na ntụlegharị agụmagụ ndị a, ka e ji chọpụta na ime nchọcha n’Isiokwu a bụ ‘Mpụtara aha otutu ụmụ nwoke na nsirihụ ndị Igbo n’usoro amụmamụ ncheke’ dabara adaba.
Nzipụta na ntụcha ngwa nchọcha
N’ebe a, ka e lebara anya n’ihe bụ ebumnobi nchọcha a, ndị bụ ịkọwa aha otutu, ụdị aha otutu ụmụ nwoke dị iche iche, ka e si nweta aha otutu ndị ahụ, echiche dị iche iche dị na ha.
Ụdị aha otutu dị iche iche
E nwere ụdị aha otutu dị iche na nsirihụ ndị Igbo. Ụfọdụ bụ ndị a na-aza site n’echiche nhụrụnanya ebe
ụfọdụbụ ndị ana-aza nwereechichenhụrụnuche. Ụfọdụ ahaotutu bụndị a zara siten’echichi ebe ụfọdụ abụghị site n’echighi echichi. N’aha otutu ndị e nwetaghị site n’echichi, ụfọdụ nwere mpụtara dị mma ebe ụfọdụ nwere mpụtara dị njọ Ụfọdụ aha otutu ma nke e chiri echi ma nke e chighi echi nwere ndị na-arụtụ aka site n’ihe mere mmadụ na ndụ ya. A ga-amalite n’aha otutu ndị e chighi echi a zara site na nhụrụnanya. Ha gụnyere:
Aha otutu mmadụ na-aza site n’ihe nhụrụnaanya 1) Asa 2) Akwụete 3) Enyi 4) Osisikankwụ 5) Ọkwụrụọka 6) Okosisi 7) Ọcha 8) Apịa 9) Atịnga 10) Obere
N’aha otutu (1), ‘Asa’ na nsirihụ ndị Igbo bụ ihe mara mma. Echiche dị na ya bụ ‘mma’. Onye a na-etu ‘Asa’ bụ onye mara mma.
N’aha otutu (2), onye a na-etu enyi pụtara onye topụrụ, kwụtịa akwụtịa n’enweghi mgbagọ ọbụla.
N’aha otutu (3), ‘Enyi’ na-egosi onye toro nnukwu ogologo ma gbaa agbaa.
N’aha otutu (4), (5) na 6) Osisikankwụ, Ọkwụrụọka na Okosisi bụ aha a na-etu onye toro nnukwu ogologo.
N’aha otutu (7), ‘Ọcha’ bụ onye dị nnukwu ọcha maọbụ anyarị
N’aha otutu (8) Onye a na-etu ‘Apịa’bụ onye toro ogologo, enweghị ume.
N’aha otutu (9) bụ ‘Atịnga’ pụtara onye dị gịrịrị nke ukwu ebe aha 10) bụ Obere na-egosi onye pere mpe mmadụ,
Aha Otutu mmadụ na-aza site na nhụrụnuche
Aha otutu ndị a bụ ndị mmadụ nwere ike ịzara maọbụ riere onwe ya site n’ihe mere na ndụ onye ahụ: 11) Ezisọrọonye 13) Onyeagwarakwe 15) Akụenwebe 17) Okwuanyịọnụ 12) Ọbatalụonye 14) Amandịanaeze 16) Azụanụka 18) Onyedịmmanazụ 19) Ikukuamanọnya 20) Etigbuchaeziokwu
Ụdị aha ndị a e depụtara n’elu ebe a abụghị aha na-egosi ka mmadụ dị n’anya. Ya bụ, ọ bụghị ihe a na-ahụ anya kamaọbụ aha a ga-etu mmadụ e were uche mata mpụtara ya. Iji maatụ aha otutu dị na (11) bụ Ezisọrọonye, echiche ọ na-egosi bụ onye na-emere onwe ya ihe etu o siri masị ya.
N’aha otutu (12) bụ Ọbatalụonye na-egosi onye nwere nkwenye na ụwa bụ ngwugwu, ihe onye tọghetara o were.
N’aha otutu (13), echiche dị n’aha otutu a bụ na ọ bụghị mmadụ niile na–anabata ndụmọdụ. A bịa n’aha otutu (14), onye na-aza ya ka aha otutu na-egosi na obi dị aghụghọ na o nweghi onye maara onye hụrụ ya n’anya na onye kpọrọ ya asị.
N’aha otutu (15), bụ Akụenwebe, na-akọwa na onye bụ ọgaraanya taa nwere ike ịnọkata daghachi azụ echi.
N’aha otutu (16), Onye na-aza Azụanụka bụ onye achọghị ịma ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya. N’aha otutu (17), onye a na-etu Okwuanyịọnụ bụ onye na-ekwute oke okwu ma na-amata njakịrị. N’aha otutu (18) bụ Onyedịmmanazụ, mpụtara ya bụ na o nweghi onye enweghi nkọcha
N’aha otutu (19) bụ Ikukuamanaọnya bụ onye na-amịchafere n’ihe ọ bụla.
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
N’aha otutu (20) bụ Etigbuchaeziokwu, onye na-aza ya bụ onye na-akwụpụta maka eziokwu oge ọ bụla. Ọ dị mkpa ịmata na aha otutu ndị a bụkarị ụdị aha otutu mmadụ na-azara onwe ya maọbụ nke ndị enyi maọbụ ikwunibe na-enye onye nke ha n’echighi echichi ọ bụla.
Aha otutu ndị chiri echichi na-azakarị na mpụtara ha Aha otutu e depụtara ebe a bụ nke ndị chiri echichi dị ka nze na ọzọ, ichie, obi d.g na-azakarị. A gaahazi ha n’ụdị mpụtara ha dị ka:
1) Nwabunie - Onye a na-etu ụdị aha ndịa bụ onye sitere n’aka nwa ya maọbụ onye ọ zụrụ wee chie echichi. Ya bụ onye nwa ya ji ego ya chie echichi
2) Ọkụnwa
3) Ọchịlịọzụọ - Onye na-aza ụdị aha otutu a bụ onye na-enwe mmasị n’izụ ụmụaka enweghi onye ga-azụ ha n’akwụkwọ maọbụ inye ndị enweghi ka ọ ha ha ihe
4.) Kpajie - Onye na-emesi ihe ike
5.) Ebubedike - Onye juru eju na mmadụ na-emesi ihe ike
6.) Akaekpuchiọnwa - Onye anaghi ezo ezo n’ihe
7.) Akụnwafọ
8.) Akụnwanne - Onye nwanne maọbụ onye ikwu ya Chiri ọzọ
9.) Ugonwanne -
10.) Akụamịa - Onye mechara nwee ego.
11.) Akụnnaya
12) Ezennịa - Onye e ji ego nna ya chie echichi.
13.) Akụnwata - Onye kpatara ego na nwa.
14) Akajiụba - Onye kpatara ego na-egosipụtakwa.
15.) Akụrienne - Onye kpata nnukwu ego na-emesapụkwa aka.
16.) Amalụnweze - Onye nna ya chịrị ọchịchị
17) Akụkalịa - Onye ego ya na-ehu ka mmiri.
18) Eselụenuego - Onye na-eri ego ya n’eleghị anya n’azụ
19) Nnayelugo - Onye a na-etu aha otutu a bụ onye ọ bụ nna ya chiri ya echichi.
20) Nwakibiya
21) Nwadịalọ
Aha otutu a bụ aha onye ọ bụ nwa ya maọbụ nwa nwanne ya chiri - ya echichi na-aza ụdị aha ndị a.
22) Ifemelụmma - Onye anaghị achọ ihe mmechu ihu
23) Nwatakwọchaa - Onye kpatara ego na nwata
24) Ọnwanetiriọha - Onye na-emenyere onye elu na onye ọbụla.
25) Kwesịakụ - Onye ji ego eme ihe a hụrụ anya
26) Ọnọnenyị - Onye a mụnyere n’ego
27) Orimili -
27) Ọnọnujuakụ -
28) Omeọgọ - Onye na-emere ndị mmadụ ihe
29) Omelọra - Onye na-eme ka ihe ọma baara onye ọ bụla
30) Ọdịnanwaemeakụ - Onye kpatara ego n’oge ma were ya na-enyere ndị mmadụ aka
31) Ezeafọjulu - Ụdị aha otutu a na-egosi onye nwere afọ ojuju n’onwe ya. Ọ naghị achọ iri nke ya na mmadụ
32) Ezechụọmagha - Onye ndị mmadụ megburu ma mechaa nwee ego
33) Ezennaya - Onye nna ya chiri ọzọ
34) Ekwueme - Onye na-eme ihe ka o siri kwuo ya
36) Ọkaomee - Onye na-emezu nkwa o kwere mmadụ maọbụ ndị mmadụ
37) Dikeọgụ - Onye siri ike anaghị emerinwu emeri ma ihe dakọọrọ ya na mmadụ
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
38) Ikemba - Onye e ji eje mba obodo ji eme ọnụ.
39) Onyeaghananwanneya - Onye a na-etu ụdị aha bụ onye ma eme nwanne
41) Agbaegonkịtị _ Onye kpatara ego ma ne-eme ihe ego
42) Nwannedịnamba – Onye na-aza aha otutu a na-emere ma ndị ezi ma ndị ulọ ihe.. Ọ bụ onye anaghị akpa oke, na-ewe onye ọ bụla ka nke ya.
43) Ọkaobuluụzọ - Onye anaghị ala azụ n’ihe a na-eme ebe ọ bụla ọ nọ.
44) Etigbuchaeziokwu – Onye na-aza ụdị aha bụ onye na-akwụpụta iche maka ikwu eziokwu
45) Igwebụike - Onye a na-etu ụdị aha a bụ onye na-achọ mmekọ na ntụkọ arọ ọnụ
46) Ebubedịke - Onye a na-etu Ebubedike bụ onye na-ewetara obodo agamnihu na Mmeri
Ụfọdụ aha otutu bụ nke e nwetara n’aha ekere ụwa dị ka:
47) Udochukwu
48) Urudịnachi
49) Ezedịnachi
50) Akụsinachi
51) Ugochinyere
52) Ifechukwukwuru
53) Chimereze
Aha ndị a na-ezipụta ka mmadụ siri nwee mmasị na Chineke. E jikwa ụdị aha ndị a eme aha echichi.
Mgbe aha otutu ụmụ nwoke ji apụtakarị ihe
Mgbe e ji etukarị nwoke aha bụ oge:
O mere ihe pụrụ iche dị ka mgbe o nyeere mmadụ maọbụ obodo aka.
Ọ nwere ihe a chọrọ ka anata ya, oge ahụ ka itu aha ya ji apụtakarị ihe.
A na-etukari nwoke aha iji gosi nkwanye ugwu na nsọpụrụ n’ebe ọ nọ
A na-etukwa mmadụ aha otutu a mgbe onye ahụ nwụrụ
A chọrọ iji ya kelee ya ekele.
A na-etukwa nwoke aha ya ma ọ gwachaa ọha mmadụ okwu.
Ọ gọchara ọjị.
Ọ dị mkpa ịmata na anaghị etu nwoke aha mgbe ọ kpara arụ n’obodo. Ọ bụrụ na o nwee ka e si tuo ya aha otutu ya, ị mara na a na-etu ya aha ahụ n’ụdị ịkwa ya emu.
Uru aha otutu bara
Aha otutu bara ọtụtụ uru n’ebe ndị a na-etu aha nọ. Uru aha otutu ụfọdụ gụnyere:
Aha otutu na-enye nwoke ugwu na nsọpụrụ mgbe a na-etu ya aha ahụ
Uru ọzọ aha otutu bara bụ na ọ na-echekwaba akparamagwa mmadụ
Aha otutu na-egosi na nwoke etozuola ihe e ji mmadụ eme.
Ọ na-enyekwa onye na-aza ya obi anụrị na afọ ojuju.
Ụfọdụ ọghọm dị n’aha otutu gụnyere:
Ọ na-eweta ntaji anya
Ọ na-eweta mmadụ imefe ihe otu ọ chọrọ ime
Nchịkọta Nchọcha a gbalịrị imejuputa ebumnobi e jiri malite ya. A tulere ihe bụ aha otutu wee sị na ya depụta ụdị aha otutu dị iche ma ndị na-akọwa ihe nhụrụnaanya ma ndị na-akọwa ihe nhụrụnuche. Ya bụ nke na-akọwa ka onye ahụ siri dị n’anya.ma nke na-akọwa ka onye ahụ si akpa agwa. Ndị a gbara ajụjụ gbalịrị ike ha izipụta ihe odee chọrọ n’aka ha site n’inye nkọwa banyere aha mmadụ nwere ike ịzara onwe ya na nke a na-aza n’ihe ndị a chọrọ. Atụtụ ndịna asụsụ ncheke na nke njirimee e jiri mee nchụcha a dabara adaba.Nchọcha a gbalịrị ịchọpụta aha otutu ndị mmadụ nwere ike ịza n’echighi echichi ọ bụla. E depụtachara aha ndị ahụ mmadụ nwere ike ịza n’echighi echchi na ndi ha na-aza ma ha chieechichi. Eziputakwara mgbe ejikarị etu mmadụ aha.otutu ya na uru aha otutu baara ndị mmadụ na-aza ya.
Nigerian Journal of Arts and Humanities (NJAH), Volume 3 Number 1, 2023 (ISSN: 2814-3760, E-ISSN: 2955-0343) Nnamdi Azikiwe University, Nigeria, Indexed inGoogle Scholar (Email:njahjournal@gmail.com)
Mmechi
Isiokwu a bụ mpụtara aha otutu ụmụ nwoke na nsirihụ ndi Igbo na usoro amụmamụ asụsụ ncheke e mere nchọcha na ya bụ isiokwu dabara adaba maka na ọ nyere aka ime ka amata aha otutu di iche iche na mpụtara ha dị ka o si dị n’okpuru ọchịchị Idemili Nọt na Saut. Ọ mere ka amata na ụmụ nwoke anaghị aza aha otutu a na nkịtị dị ka e si hụta n’ uru ahaotutu bara. Maka uru aha otutu bara ka nchọcha a ji ekwusi ike na nchọcha a bụ nke dabara adaba. Ma ka o sila dị, nchọcha a bụghị ejecha ọgwụ maka ya, odee na-atụ aro ka ndị chọrọ ime nchọcha n’ihe yiri Isiokwu a gaa n’ihu isi n’uzo ọzọ mere nke ha gawa. Ka ihe e dere n’isiokwu a bawanyekwuo
Ndị A Gbara Ajụjụ Ọnụ
AKAỌRỤ AFỌ
Nwabufo Mozie Ogidi Azụmahịa Afọ iri isii na atọ
Okechukwu Okafọ Uke Ọrụ Oyibo Afọ iri ise na isii
Nnamdị Okonkwo Nnobi Ọrụ aka Afọ iri asaa
Okemdị Uzọdịmma Ọba Ọrụ aka Afọ iri isii na abụọ
Ifeanyị Okeke Ọraukwu Ọrụ Oyibo Afọ iri isii
Obinna Okoye Umuoji Ọrụ aka Afọ iri isii na asatọ
Emeka Ugonnaya Nnokwa Ọrụ ugbo Afọ iri isii
Edensibịa
Croft, W. & Cruse, D. A. (2004). Cognitive linguistics. Oxford: Oxford University Press.
Dingemanse, M. (2006).The bodyin Yoruba: alinguistic study. MA thesis. Leiden, Leiden University, Leiden.
Lakoff, G (1987) Metaphors we live by. Chicago: University of Chicago Press.
Lakoff, G. & Johnson, M. (1980). Metaphors we live by. Chicago: Uniiversity of Chicago Press. Langacker R. W (1987). Foundations of cognitive grammar 1. Standford: Standford University Press. Ekwealọ, C. C. (1996). Omenala na ewumewu ndị Igbo. Ọnịcha: Africana First. Geertz, P. (2006). Person, time and conduct in Bali. An essay in cultural analysis. Program cultural r eport series. Yale: South East Asian Studies.
Mbiti, J. S. (1977). African religion and philosophy. London: Heinemann.
Mbah, B. M. (2019). Ndetu nkụzi, Ph.D Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Eshia, Mahadum Nnamdi Azikiwe, Ọka.
Mbah, B. M. Mbah, E. E., Ikeokwu, E. S., Okeke, C. O., Nweze, I. M., Ugwuona, C. N., Akaeme, C.M., Onu, J.O., Eze, E.A., Prezi, G. O. & Odili, B. C. (2013). Igbo adị: Igbo-English, English-Igbo dictionary of linguistics and literary terms. Nsukka: University of Nigeria Press.
Obaji, C. N. (1982). ‘Language’ Philosophical magazine. Ikot Ekpene: Bigard. Memorial Seminary Press.
Isidienu, C. (2018) Ebe a ga-ahụ nsirihụndụ ndị Igho. Odezuruigbo jọnalụ, 2(1)1-16 Johnson, M. (1987). The body in the mind. The bodily basis of meaning, reason and imagination. Chicago: Chicago University Press.
Lakoff,G.(1987) Women, fire and dangerous things: What categories reveai about the mind .Chicago: Uniiversity of Chicago Press.
Langacker, R. W. (1987). Foundations of cognitive grammar 1. Standford: Standford University. Mbah, B. M. & Mbah, E. E. (2014). Atụtụ amụmamụ asụsụ. Nsukka: University of Nigeria Press.
Ogwụdile, C.E.C (2019) The socio-cultural and linguistic Implications of Igbo Names: a case study of Ezeagu north local government area of Enugu state, Nigeria. Odezuruigbo: An International journal of Igbo, African and Asian studies .3. (1) 152-163
Saeed, J.I. (2009). Semantics Oxford: Blackwell Publishers William, B. (2005). The New Encyclopedia Britannica, vol. 24 Marcropedia. U.S.A. Encyclopedia Britannica Inc.
Yule, G. (1997). The study of language (2nd ed.). Cambridge: Cambridge University Press. 28.