Nehemaịa ISI NKE 1 1 Okwu Nehemaia nwa Hakalaia. O rue, n'ọnwa Kisleu, n'arọ nke-orú, mb͕e mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze; 2 Hanani, bú otù nime umu-nnem, we bia, ya onwe-ya na ufọdu ndikom Juda; m'we jua ha bayere ndi-Ju ndi b͕apuru ab͕apu, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha, na bayere Jerusalem. 3 Ha we sim, Ndi fọduru ndi fọduru n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi, nọ n'oké nkpab͕u na ihe-ita-uta: a kwatuwo kwa mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku. 4 O rue, mb͕e m'nuru okwu ndia, na m'we nọdu ala, kwa ákwá, ru uju ubọchi ufọdu, buru ọnu, kpe kwa ekpere n'iru Chineke nke elu-igwe; 5 Ọ si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke Nke di uku di kwa egwu, Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere nke ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu; 6 Ma ub͕u a ka nti-gi ṅa nti, meghe kwa anya-gi abua, ka i we nu ekpere orù-gi, nke mu onwem nēkpere n'iru gi ub͕u a, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-gi, kwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide gi: ma mu onwem na ulo nnam emehiewo. 7 Ayi emejọwo gi nke-uku, ayi edebeghi kwa ihe nile enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke I nyere Moses, bú orù-gi, n'iwu. 8 Biko, cheta okwu ahu nke I nyere orù-Gi Moses n'iwu, si, Ọ buru na unu emehie, M'gāchusa unu n'etiti mba nile; 9 Ma ọ buru na unu chigharikutem, debe kwa ihe nile M'nyere n'iwu, me ha; ọ bu ezie na ufọdu nime unu achupuworo rue nsọtu elu-igwe, ma M'gāchikọta ha n'ebe ahu, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputara itiye aham n'ebe ahu. 10 Ma ndia bu ndi-orù-gi na ndi-Gi, ndi I jiriworo ike uku Gi na aka-Gi di ike b͕aputa. 11 YHWH, biko, biko, ka nti-Gi ege nti n'ekpere orù-Gi, na n'ekpere ndi-orù-Gi, bú ndi nātu egwu aha-Gi: biko, me ka ọ ga nke-ọma, orù-Gi, ta, me kwa ya ebere n'iru nwoke a. N'ihi na abum onye-ihe-ọṅuṅu nke eze. ISI NKE 2 1 O rue, n'ọnwa Nisan, n'arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n'iru ya: m'we buru manya-vine ahu, nye eze. Ugbu a, enwetụbeghị m mwute n'ihu ya. 2 N'ihi nka eze sirim, N'ìhi gini ka iru-gi di ọku, ebe i nāriaghi ọria? nke a abụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị mwute nke obi. Mgbe ahụ, ụjọ tụrụ m nke ukwuu. 3 Ọ si eze, Ka eze di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: n'ìhi gini ka irum nāgaghi-adi ujọ, mb͕e obodo ahu, bú ebe ílì nnam-hà, tọb͕ọrọ n'efu, ewe rechapu kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku? 4 Eze we sim, Gini ka i nāriọ? M wee kpekuo Chineke nke eluigwe ekpere. 5 M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na orùgi ahutawom amara n'iru-gi, na i gēzigam je Juda, rue obodo ílì nnam-hà, ka m'we wue ya.
6 Eze we sim, (nwayi eze nānọdu kwa n'akuku ya,) Rùe ole mb͕e ka ije-gi gādi? òle mb͕e i gālaghachi kwa? O we di eze nma izigam; m'we nye ya oge. 7 M'we si eze, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enyem akwukwọ-ozi nye ndi-isi n'ofè osimiri, ka ha we me ka m'gabiga rue mb͕e m'batara Juda; 8 na akwukwọ-ozi akwukwọ nye Esaf, bú onye nēche oké ọhia nke eze, ka o we nyem osisi ime ibo-ọnu-uzọ-ama nke ulo uku uku nke ulo ahu, na ime mb͕idi obodo, na ime ulo ahu nke m'nābà nime. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum. 9 M'we biakute ndi-isi n'ofè osimiri, nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze eziteworom ndi-isi usu-ndi-agha na ndiinyinya ka ha sorom. 10 Sanbalat, bú onye Horonait, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, iwe di ha nke-uku na nwoke abiawo ichọ udo nke umu Israel. 11 M'we bia Jerusalem, nọ kwa n'ebe ahu ubọchi atọ. 12 M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole tiyerem; egosighikwam onye ọ bula ihe Chinekem tiyere n'obim ime na Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ọhia ọ bula diyerem, ma-ọbughi anu-ọhia ahu nke m'nọkwasiworo n'elu ya. 13 M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, n'iru olùlù-miri dragọn, na n'ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, m'we hu mb͕idi Jerusalem, nke etipiaworo, na erechapu kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku. 14 M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi ahu, ru kwa ọdọmiri nke eze: ma ọ dighi ebe anumanu di nke di n'okpurum gāgabiga. 15 M'we rigo n'abali n'akuku miri-iyi, le mb͕idi anya, laghachi, si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ba, we laghachi. 16 Ma ndi-isi amaghi ebe M'jere, ma-ọbu ihe M'mere; kwa kwakwakwakwaghmmአ ል -m ya ndi fọduru ọ fọduru ndi-orù a ub͕u a. 17 M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu nkpab͕u nke ayi nọ na ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, ewe sure kwa ọnu-uzọama-ya nile n'ọku: bia, ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu ihe-ita-uta ọzọ. 18 M'we gosi ha bayere aka Elohimm nke di nma n'arum; dika okwu nile nke eze gwaram si di. Ha we si, Ka ayi bilie wu ulo. Ha we me ka aka-ha di ike bayere ezi ọlu a. 19 Ma Sanbalat, bú onye Horon, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, lelìa ayi, si, Gini bu ihe a nke unu nēme? unu gānupu isi n'okpuru eze? 20 M'we za ha, si ha, Elohim nke elu-igwe, Ya onwe-ya gēme ka ihe nāgara ayi nke-ọma; n'ihi nka ayi onwe-ayi, bú ndi-orù-Ya, gēbili, wue ulo: ma unu enweghi òkè, ma-ọbu ezi omume, ma-ọbu ihe-ncheta, nime Jerusalem. ISI NKE 3 1 Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nneya, bú ndi-nchu-àjà, wue ọnu-uzọ-ama aturu; ha do ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Mea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel. 2 Ndikom Jeriko we wue n'akuku ya. Zakọ nwa Imri we wue n'akuku ha.