Joshua ISI NKE 1 1 Ma mb͕e ọnwu Moses, bú orù Jehova, gasiri, na Jehova gwara Joshua nwa Nun, bú orù Moses, okwu, si, 2 Moses, bú orùm, anwuwo; ma ub͕u a bilie, gabiga Jọdan nka, gi onwe-gi na ndi nka nile, rue ala ahu nke Mu onwem nēnye ha, bú umu Israel. 3 Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi, nke ahu ka M'nyeworo unu, dika M'siri Moses. 4 Site n'ọzara na Lebanon nka we rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis, ala nile nke ndi Het, ru kwa oké osimiri nke chere iru n'ọdida-anyanwu, ka ókè-ala-unu gādi. 5 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-arapu gi, M'gaghi-arapu kwa gi. 6 Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na ndi nka ka i gēkesa ala ahu, nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha. 7 Nání di ike, nwe kwa ume nke-uku, ka i we lezi anya ime dika iwu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: esila n'ebe ahu wezuga onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'akaekpe, ka i we mara gi nke-ọma n'ebe ọ bula i nāga. 8 Akwụkwọ iwu a agaghị apụ apụ n’ọnụ gị; ma i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezi anya ime dika ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ si di: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka uzọ-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu ka i gēnwe ezi ihe. 9 Ọ̀ bughi Mu onwem enyeworo gi iwu? Di ike, nwe kwa ume; atula egwu, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi ebe ọ bula i nēje. 10 Joshua we nye ndi-isi nke ndi Israel iwu, si, 11 Gabiganu ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Dozienu ihe-oriri; n'ihi na n'ubọchi atọ unu gāgabiga Jọdan nka, ibà inweta ala ahu, nke YHWH, bú Elohim-unu, nēnye unu ka unu nweta ya. 12 Joshua we gwa ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, okwu, si, 13 Cheta okwu ahu nke Moses, bú orù Jehova, nyere unu n'iwu, si, YHWH, bú Elohim-unu, emewo ka unu zuru ike, nye kwa unu ala nka. 14 Ndinyom-unu na umu-ntakiri-unu na anu-ulo-unu gānọgide n'ala ahu nke Moses nyere unu n'ofè Jọdan; ma unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, ejikere, unu ndi-dike nile, bú dìnkpà, nyere ha aka; 15 rue mb͕e YHWH gēme ka umu-nne-unu zuru ike, dika O nye-kwa-ra unu, ha ewe nweta kwa ala ahu nke YHWH, bú Elohim-unu, nēnye ha: unu ewe laghachi n'ala nke iheonwunwe-unu, rie ya utọ, nke Moses, bú orù Jehova nyere unu n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu. 16 Ha we za Joshua, si, Ihe nile nke I nyeworo ayi n'iwu, ayi gēme, ma ebe ọ bula i nēziga ayi, ayi gāla. 17 Dị ka anyị gere Mozis ntị n'ihe niile, otú ahụ ka anyị gaege gị ntị: nání na Jehova, bụ́ Chineke gị, nọyere gị, dị ka Ọ nọnyeere Mozis. 18 Onye ọ bula nke nānupu isi n'okwu-ọnu-gi, ma ọ nughi kwa okwu-gi nile n'ihe nile nke I nēnye ya n'iwu, agēme ka ọ nwua: nání di ike, nwe kwa ume.
ISI NKE 2 1 Joshua nwa Nun we si na Shitim ziga ndikom abua na nzuzo, si, Jenu le ala ahu anya, bú Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwanyi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, nọ ọnọduabali n'ebe ahu. 2 Ewe gosi eze Jeriko, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a nke umu Israel iledo ala ahu. 3 Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Kpọputa ndikom ahu ndi biakutere gi, ndi baworo n'ulo-gi: n'ihi na ha biaruru ileputa ala nka nile. 4 Nwayi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha, si otú a, Ndikom ahu biakuterem, ma amaghm ebe ha siri bia; 5 O rue, mb͕e nchichi nke ọnu-uzọ-ama, mb͕e ọchichiri b͕a, na ndikom ahu puru: ebe ndikom ahu nāga, amaghim: chua ha ọsọsọ; n'ihi na unu gāchuru ha aru. 6 Ma ọ mere ka ha rigota n’elu ulo, were okporo flax zoro ha, nke o doziri n’usoro n’elu ulo. 7 Ndikom ahu we chua ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ma mb͕e ndi nāchu ha puru, ha mechibidoro ọnu-uzọ-ama. 8 Ma tutu ha edina, ọ rigokuru ha n’elu ulo; 9 Ọ si ndikom ahu, Amawom na YHWH enyewo unu ala nka, na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, na ike nāda kwa ndi nile bi n'ala nka n'ihi unu. 10 N'ihi na ayi anuwo otú YHWH mere ka miri nke Oké Osimiri Uhie takọrọ n'ihi unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi nọ n'ofè Jọdan, Saihon na Ọg, ndi unu mere ka ebibie ya. 11 Ma mb͕e ayi nuru ihe ndia, obi-ayi we b͕aze, ọ dighi kwa obi-ike fọduru n'aru onye ọ bula, n'ihi unu: n'ihi na YHWH, bú Elohim-unu, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe n'elu, na n'uwa di n'okpuru. 12 Ma ub͕u a, biko, were YHWH ṅuaram iyi, ebe M'mere unu ebere, na unu gēmere ulo nnam ebere, nyekwam iheiriba-ama ezi-okwu; 13 Ma na unu ga-azọpụta nna m, na nne m, na ụmụnne m nwoke, na ụmụnne m ndị nwanyị, na ihe nile ha nwere, ma napụta ndụ anyị site n’ọnwụ. 14 Ndikom ahu we za ya, si, ndu-ayi diri unu, ọ buru na unu ekwughi okwu-ayi nka. Ọ gēru kwa, mb͕e Jehova nyeworo ayi ala nka, na ayi gēmere gi ebere na ezi-okwu. 15 O we were udọ̀ weda ha site na window: n'ihi na ulo-ya di n'elu mb͕idi obodo, o we biri na mb͕idi. 16 Ọ si ha, Jenu n'ugwu, ka ndi nāchu unu we ghara izute unu; zo-kwa-nu onwe-unu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha gālaghachi: emesia unu gēje kwa ije-unu. 17 Ndikom ahu we si ya, Ayi gābu ndi zuru okè n'iyi-gi a nke i meworo ka ayi ṅua. 18 Le, mb͕e ayi batara n’ala ahu, i gēke eriri ogho uhie a na window nke i mere ka ayi rida: i gēme kwa ka nna-gi na nne-gi na umu-nne-gi na ulo nna-gi nile biakute gi. 19 Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke nāpu n'ọnu-uzọ ulo-gi rue amá, ọbara-ya gādi n'isi-ya, ma ayi gābu ndi ikpe nāmaghi: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādi n'isi-ayi, ọ buru na aka ọ bula di n'aru ya. 20 Ma ọ buru na i kwuputa okwu-ayi nka, ayi gābu kwa ndi ezi omume n'iyi-gi nke i meworo ka ayi ṅua. 21 Ọ si, Dika okwu-unu si di, otú a ka ọ di. O we zilaga ha, ha we la: o we ke eriri uhie ahu na window. 22 Ha we je, biarue ugwu, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ, rue mb͕e ndi nāchu ha lata: ndi nāchu ha we chọ ha n'uzọ nile, ma ha achọtaghi ha.