2 Ndị eze
18 Ma okwu Ehazaia nke fọduru nke o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
ISI NKE 1
1 O rue, mb͕e YHWH gaje iwere Elaija ba n'elu-igwe n'oké ifufe, na Elaija siri na Gilgal je, ya na Elaisha. 2 Elaija we si Elaisha, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezitewom ijeru Bet-el. Elaisha we si ya, YHWH nādi ndu, na nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, m'gaghi-arapu gi. Ha wee gbadaa Betel. 3 Umu-ndikom ndi-amuma ndi nọ na Bet-el we pukuru Elaisha, si ya, Ì mawo na Jehova gēwezuga onye-nwe-gi n'isi-gi ta? Ọ si, E, amawom ya; danu nkiti. 4 Elaija we si ya, Elaisha, biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezitewom ijeru Jeriko. Ọ si, YHWH nādi ndu, na nkpuru-obi-gi nādi ndu, m'gaghi-arapu gi. Ha wee bịarute Jeriko. 5 Umu-ndikom ndi-amuma ndi nọ na Jeriko we biakute Elaisha, si ya, Ì mawo na Jehova gēwezuga onye-nwe-gi n'isi-gi ta? Ọ si, E, amawom ya; danu nkiti. 6 Elaija we si ya, Biko, nọdu n'ebe a; n'ihi na Jehova ezitewom na Jọdan. Ọ si, YHWH nādi ndu, na nkpuru-obigi nādi ndu, m'gaghi-arapu gi. Ha abua we ga n'iru. 7 Ọgu ndikom abua na iri sitere n'umu ndi-amuma we je, guzo n'ebe di anya n'iru: ha abua we guzo n'akuku Jọdan. 8 Elaija we were uwe-nwuda-ya, kekọta ya, tie miri ahu, ewe kewara ha iru na iru, ha abua we gabiga n'ala-akọrọ. 9 O rue, mb͕e ha gabigara, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'aru gi. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim. 10 Ọ si, Ihe siri ike ka i riọworo: ma ọ buru na i hum mb͕e anānapum n'ebe i nọ, ọ gādi-kwa-ra gi otú a; ma ọbụrụ na ọ bụghị, ọ gaghị adị otú ahụ. 11 O rue, mb͕e ha nāga n'iru nēkwu okwu, na, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nēkesa ha abua; Elaija we were oké ifufe rigorue elu-igwe. 12 Elaisha we hu ya, tie nkpu, si, Nnam, nnam, ub͕ọ-ala Israel na ndi-inyinya-ya. Ọ hughi kwa ya ọzọ: o we jide uwe-ya, dọwa ha n'ọbubọ abua. 13 Ọ chiri kwa uwe-nwuda Elaija, nke daworo n'aru ya, laghachi, guzo n'akuku Jọdan; 14 O we chiri uwe-nwuda Elaija nke dapuru ya, tie miri ahu, si, Òle ebe YHWH, bú Elohim Elaija nọ? ma mb͕e o tib͕uru miri ahu, ha we kewa otu a na ebe ọzọ: Elaisha we gabiga. 15 Umu-ndikom ndi-amuma ndi nēle anya na Jeriko we hu ya, si, Mọ nke Elaija nādakwasi Elaisha. Ha we bia izute ya, kpọ isi ala nye ya. 16 Ha we si ya, Biko, le, ọgu ndikom abua na iri di ike nọyere ndi-orù-gi; biko, ka ha je, chọ onye-nwe-gi: eleghi anya Mọ nke Jehova eweliwo ya, tubà ya n'otù ugwu, maọbu n'otù ndagwurugwu. Ọ si, Unu ezila-kwa-la. 17 Ha we rugide ya rue mb͕e ihere mere ya, Ọ si, Ziga. Ha we ziga ọgu ndikom abua na iri; ha we chọ ubọchi atọ, ma ha achọtaghi ya. 18 Ha we biakute ya ọzọ, (n'ihi na ọ nēguzo na Jeriko,) Ọ si ha, Àsighm unu, Unu alala? 19 Ndikom obodo ahu we si Elaisha, Biko, le, ọnọdu obodo a di nma, dika onye-nwem nāhu: ma miri ahu abughi ihe-efu, ala adighi kwa ihe-ndabere. 20 Ọ si, Wetaranum ite ọhu, tiye nnú nime ya. Ha we wetara ya ya.
1 Moab we nupu isi megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri. 2 Ehazaia we da site n'ihe-idọba-oriọna nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, we ria ọria: o we ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Bealzebọb, bú chi Ekron, ase ma m'gādike n'ọria nka. 3 Ma mọ-ozi nke Jehova we si Elaija, bú onye Tisbe, Bilie, rigorue ndi-ozi eze Sameria, si ha, Ọ bughi n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na unu nēje iju Bealzebub, bú chi Ekron, ase? 4 Ma ub͕u a otú a ka Jehova siri, I gaghi-esi n'ihe-ndina ahu nke i rigoro n'elu rida, kama i ghaghi inwu. Elaija we pua. 5 Ndi-ozi ahu we laghachikuru ya, si ha, N'ìhi gini kwa ka unu onwe-unu laghachiri? 6 Ha we si ya, Otù nwoke we rigo izute ayi, si ayi, Jenu, laghachikuru eze nke zitere unu, si ya, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bughi n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel, na i nēziga iju Bealzebub, bú chi Ekron, ase? ya mere i gaghi-esi n'ihendina ahu nke i rigoro n'elu rida, ma i ghaghi inwu. 7 Ọ si ha, Òle madu bu onye rigoro izute unu, gwa unu okwu ndia? 8 Ha we za ya, si, Nwoke ahu bu aji-aji, ekewo-kwa-ra iheọkiké akpukpọ n'úkwù-ya. Ọ si, Ọ bu Elaija onye Tisbe. 9 Eze we zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ya na ọgu ndi-agha abua na iri-ya. O we rigokuru ya: ma, le, ọ nānọdu n'elu ugwu. Ọ si ya, Gi onye nke Chineke, eze asiwo, Ridata. 10 Elaija we za, si onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si kwa n’eluigwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. 11 Ọzọ, o zigara ya onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Ọ zara, si ya, Onye nke Chineke, otú a ka eze siri, Ridata ọsọsọ. 12 Elaija we za, si ha, Ọ buru na onye nke Chineke ka m’bu, ka ọku si n’elu-igwe ridata, ripia gi na ọgu ndi-agha abua na iri gi. Ọku nke Chineke we si n'elu-igwe ridata, ripia ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. 13 O we ziga kwa onye-isi nke ọgu ndi-agha abua na iri ahu ọzọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri-ya. Ma onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia, da n'alaya n'ala n'iru Elaija, riọ ya, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia di oké ọnuahia n'anya-gi. 14 Le, ọku siri n'elu-igwe ridata, rechapu ndi-isi abua nke ọgu ndi-agha abua na iri ahu na ọgu ndi-agha abua na iri-ha: ma ub͕u a ka ndum di oké ọnu-ahia n'anya-Gi. 15 Mọ-ozi nke YHWH we si Elaija, Soro ya rida: atula egwu ya. O we bilie, soro ya ridakuru eze. 16 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zigawo ndi-ozi iju Bealzebub, bú chi Ekron, ase, ọ̀ bughi n'ihi na ọ dighi Chineke di n'Israel iju ase okwu-Ya? ya mere i gaghi-esi n'ihe-ndina ahu nke i rigoro n'elu rida, ma i ghaghi inwu. 17 O we nwua dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we buru eze n'ọnọdu ya n'arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n'ihi na o nweghi nwa-nwoke.
ISI NKE 2