Skip to main content

Igbo - The Book of 1st Kings

Page 1

1 Ndị Eze ISI NKE 1 1 Ma eze, bú Devid, aghọwo agadi, ubọchi ndu-ya di kwa ike; ha we were uwe kpuchie ya, ma ọ hughi ọku. 2 Ndi-orù-ya we si ya, Ka achọputa onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, ka o we hu ya anya, ka ọ dina kwa n'obi-gi, ka onye-nwem, bú eze we di ọku. 3 Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n'ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag, bú nwayi Shunem, me ka ọ biakute eze. 4 Nwa-ab͕ọghọ ahu we ma nma nke-uku, ọ nāhu kwa eze n'anya, nēje-kwa-ra ya ozi: ma eze amaghi ya. 5 Adonaija nwa Hagit we bulie onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya. 6 Ma nna-ya emeghi ya iwe mb͕e ọ bula, si, Gini mere i meworo otú a? ma ya onwe-ya bu kwa nwoke mara nma nke-uku; nne-ya we mua ya mb͕e Absalom gasiri. 7 O we kpayere Joab nwa Zeruaia na Abaiata, bú onyenchu-àjà, kpayere ya uka: ha we so Adonaija yere ya aka. 8 Ma Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na Netan, bú onye-amuma, na Shimai, na Rei, na ndi-dike nke Devid, esoghi kwa Adonaija. 9 Adonaija we b͕ue ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi na ìgwè ehi mara abuba n'akuku nkume Zohelet, nke di n'akuku Enrogel, kpọ kwa umu-nne-ya nile, na umu-ndikom eze, na ndikom nile nke Juda, bú ndi-orù eze: 10 Ma Netan, bú onye-amuma, na Benaia, na ndi-dike, na Solomon, bú nwa-nne-ya, ọ kpọghi. 11 Netan we gwa Bat-sheba, bú nne Solomon, okwu, si, Ì nughi na Adonaija nwa Hagit aghọwo eze, ma Devid, bú onye-nwe-ayi, amaghi ya? 12 Ma ub͕u a, bia, biko, ka m'dọrọ gi ọdu, ka i we zọputa ndu-gi na ndu nwa-gi Solomon. 13 Je, bakuru eze, bú Devid, si ya, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bughi gi onwe-gi ṅuru orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ọ gānọkwasi kwa n'ocheezem? gini mere Adonaija ji buru eze? 14 Le, mb͕e i nọ nākpayere eze uka n'ebe ahu, mu onwem gēso kwa gi bata, me ka okwu-gi guzosie ike. 15 Bat-sheba we bakuru eze n'ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku; Abishag, bú nwayi Shunem, we nējere eze ozi. 16 Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ? 17 Ọ si ya, Onye-nwem, i were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem. 18 Ma ub͕u a, le, Adonaija bu eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya; 19 O b͕u-kwa-ra ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu bara uba, kpọ kwa umu-ndikom eze nile, na Abaiata, bú onye-nchu-àjà, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha: ma ọ kpọghi Solomon, bú orù-gi. 20 Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri.

21 Ma o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-yahà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, bú ndi-nmehie. 22 Ma, le, mb͕e ọ nākpayere eze uka, Netan, bú onyeamuma, bata-kwa-ra. 23 Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O rue, mb͕e ọ batara n'iru eze, kpọ isi ala n'iru eze, kpue iru-ya n'ala. 24 Netan we si, Onye-nwem, bú eze, ọ̀ bu Gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem? 25 N'ihi na ọ ridara ta, b͕u-kwa-ra ehi na anu mara abuba na aturu bara uba, kpọ kwa umu-ndikom eze nile, na ndi-isi usu nile nke ndi-agha, na Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze di Adonaija. 26 Ma mu onwem, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Benaia nwa Jehoiada, na orù-gi, bú Solomon,, ọ kpọghi. 27 Ọ̀ bu nka ka onye-nwem, bú eze, meworo, ma i gosighi orù-gi, bú onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri? 28 Eze, bú Devid, we za, si, Kpọnum Bat-sheba. O we bia n'iru eze, guzo n'iru eze. 29 Eze we ṅua iyi, si, YHWH nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile; 30 Ọbuná dika m'were Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara gi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem n'ọnọdum; otú a ka m'gēme kwa ubọchi ta. 31 Bat-sheba we rube isi kpue iru-ya n'ala, kpọ isi ala nye eze, si, Ka onye-nwem, bú eze, bú Devid, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. 32 Eze, bú Devid, we si, Kpọnum Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada. Ha we bia n'iru eze. 33 Eze we si ha, Werenu ndi-orù onye-nwe-unu n'aka-unu, me-kwa-nu ka Solomon nwam nọkwasi n'elu inyinya mule nkem, me ka ọ ridarue Gaihon; 34 ka Zedok, bú onye-nchu-àjà na Netan, bú onye-amuma, te kwa manu n'ebe ahu ibu eze Israel: fù-kwa-nu opì-ike, si, Ka eze, bú Solomon, zọputa. 35 Unu gēso kwa ya n'azu rigo, ka o we bia, nọkwasi n'oche-ezem; n'ihi na ya onwe-ya gābu eze n'ọnọdum: ọ bu kwa ya ka m'nyeworo ibu onye-ndú Israel na Juda. 36 Benaia nwa Jehoiada we za eze, si, Amen: ka Jehova, bú Chineke nke onye-nwem, bú eze, si kwa otú a. 37 Dika Jehova nọyere onye-nwem, bú eze, ọbuná otú a ka ya na Solomon di, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze onye-nwem, bú eze Devid. 38 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret, na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule eze, bú Devid, me ka ọ bia rue Gaihon. 39 Zedok, bú onye-nchu-àjà, we were mpi manu n'Uloikwū ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndi Israel nile we si, Ka eze di ndu, bú Solomon. 40 Ndi Israel nile we soro ya rigota, ndi Israel we bù ọ̀jà, we ṅuria ọṅu uku, ala we b͕awa n'olu-ha. 41 Adonaija na ndi nile akpọrọri ya, we nu ya mb͕e ha risiri nri. Joab we nu olu opì-ike, ọ si, N'ìhi gini ka olu obodo a nāb͕a nb͕a aghara?


Turn static files into dynamic content formats.

Create a flipbook