Kpakpando n'Akwụkwọ Nsọ Mgbe m lere eluigwe Gị anya, ọrụ mkpịsị aka Gị, ọnwa na kpakpando, nke I doziri; Gịnị ka mmadụ bụ, nke mere i ji na-echeta ya, gịnịkwa ka nwa nke mmadụ bụ, nke mere i ji na-eleta ya? Abụ Ọma 8:3-4
Pentateuch Chineke wee mee nnukwu ìhè abụọ; ìhè ka ukwuu ka ọ chịa ehihie, ìhè ka nta ka ọ chịa abalị; o mekwara kpakpando. Jenesis 1:16 O we kpọputa ya n'èzí, si, Biko, legide anya n'eluigwe, kọọ kpakpando, ọ bụrụ na ị nwere ike ịgụta ha: O wee sị ya, Otú a ka mkpụrụ gị ga-adị. Jenesis 15:5 Na n'ịgọzi m ga-agọzi gị, n'ime ka m bawanye mkpụrụ gị, m ga-emekwa ka ọ baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá dị n'ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya. Jenesis 22:17 M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile: n'ime nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi kwa; Jenesis 26:4 Ọ rọrọ nrọ ọzọ, kọọrọ ya ụmụnne ya, sị: “Lee, nrọ ọzọ ka m rọrọ; lee, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu kpọọrọ m isiala.” Jenesis 37:9 Cheta Abraham, Aịzik, na Izrel, ndị ohu gị, ndị i ji onwe gị ṅụọ iyi, sị ha, M ga-eme ka mkpụrụ unu baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, ala a niile m kwuru okwu ya M ga-enyekwa mkpụrụ unu, ha ga-eketakwa ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọpụpụ 32:13 M ga-ahụ ya, mana ọ bụghị ugbu a: M ga-ahụ ya, mana ọ bụghị nso: Kpakpando ga-esi na Jekọb pụta, mkpanaka ga-esikwa n'Izrel bilie, ọ ga-etikwa akụkụ Moab, ọ ga-ebibikwa ụmụ Shet niile. Ọnụọgụgụ 24:17 Jehova, bụ́ Chineke unu, emeela ka unu baa ụba, lee, unu dị ka kpakpando eluigwe taa n'ọtụtụ. Diuterọnọmi 1:10 Ka i wee ghara iweli anya gị elu n'eluigwe, ma mgbe ị hụrụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, ọbụna usuu nile nke eluigwe, a ga-akwali gị ife ha ofufe, ma jeere ha ozi, bụ́ ndị Jehova, bụ́ Chineke gị, kesara nye mba niile dị n'okpuru eluigwe dum. Diuterọnọmi 4:19