Eziokwu zuru oke nke Baịbụl Jisọs sịrị ya, “ Abụ m ụzọ, eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m, ma ọ bụghị site na mụ.” Jọn 14:6 Gbaa mbọ maka eziokwu ruo ọnwụ, Onyenwe anyị ga-alụkwa ọgụ maka gị. Ecclesiasticus 4:28
Pentateuch Ọ sịrị, “Onye a gọziri agọzi ka Jehova, bụ́ Chineke nke onyenwe m Abraham, bụ, Onye na-ahapụghị ebere ya na eziokwu ya n'ebe onyenwe m nọ: Mụ onwe m, ka Jehova duziri m gaa n'ụlọ ụmụnne nna m ukwu.” Jenesis 24:27 Adịghị m eru eru maka ebere na eziokwu niile, nke ị gosiri ohu gị, n'ihi na ejiri m mkpara m gafee Jọdan a; ugbu a aghọwo m otu ìgwè abụọ. Jenesis 32:10 Zipu otu onye n'ime unu, ka o kuta nwanne unu nwoke, unu onwe-unu gānọ kwa n'ulo-nkpọrọ, ka ewe gosi okwu-unu, ma ọ bu eziokwu di n'ime unu: ma ọ bughi otú a, site n'ike Fero, unu bu ndinledo n'ezie. Jenesis 42:16 I ga-esikwa n'etiti mmadụ niile họpụta ndị nwere ike, ndị na-atụ egwu Chineke, ndị eziokwu, ndị naakpọ anyaukwu asị; meekwa ndị a ka ha bụrụ ndị isi n'isi ha, ka ha bụrụ ndị isi nke puku kwuru puku, na ndị isi nke narị otu narị, na ndị isi nke iri ise na iri, na ndị isi nke iri. Ọpụpụ 18:21 Jehova we gabiga n'iru Ya, kpọsa, si, Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye amara, Onye nwere ogologo ntachi obi, Onye bara uba n'ebere na eziokwu; Ọpụpụ 34:6 Mgbe ahụ, ị ga-ajụ ase, chọọ, jụọkwa nke ọma; ma lee, ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, ihe ahụ eguzosikwara ike, na e meela ihe arụ dị otu a n'etiti unu; Diuterọnọmi 13:14 Ọ bụ Oké Nkume ahụ, ọrụ ya zuru oke: n'ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi: Chineke nke eziokwu na onye na-enweghị ajọ omume, onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bụ. Diuterọnọmi 32:4
Akụkọ ihe mere eme Ugbu a, tụọnụ egwu Jehova, feekwanụ Ya ofufe n'ezi obi na n'eziokwu: wezugakwanụ chi nile nke nna unu hà fere n'ofe Osimiri ahụ na n'Ijipt, feekwanụ Jehova ofufe. Jọshụa 24:14 Ogwu ahụ wee sị osisi ndị a: Ọ bụrụ na unu na-ete m mmanụ n'ezie dị ka eze unu, bịanụ tụkwasị obi n'onyinyo m: ma ọ bụrụ na ọ bụghị, ka ọkụ si n'ogwu ahụ pụta, ripịa osisi cedar nke Lebanọn. Ndị Ikpe 9:15 Naanị tụọ egwu Jehova, feekwanụ Ya ofufe n'eziokwu n'obi unu dum: n'ihi na leenụ ihe ukwu O meere unu. 1 Samuel 12:24 Devid wee zaa onye nchụàjà ahụ, sị ya: “N’ezie, e gbochiri ụmụ nwanyị ka ha ghara ịhụ anyị ihe dị ka ụbọchị atọ a, site n’oge m pụtara, ihe ụmụ okorobịa ahụ dịkwa nsọ, achịcha ahụ dịkwa ka ihe a na-ahụkarị, ọ bụ ezie na e doro ya nsọ taa n’ime ite ahụ.” 1 Samuel 21:5